Jump to content

Damaturu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Damaturu bụ ógbè gọọmentị ime obodo na isi obodo nke Yobe Steeti dị n'ebe ugwu Naịjirịa . [1] Ọ bụ isi ụlọ ọrụ nke alaeze Damaturu. [2]

Ọgba okirikiri dị na Damaturu
A na-ewu ahịa ọgbara ọhụrụ nke Burabura

Steeti Damaturu bụ isi obodo na isi ụlọ ọrụ nchịkwa nke Yobe Steeti na ebe gọvanọ bi ma na-anabata Ministri Gọọmentị Steeti, Ngalaba na Ụlọ Ọrụ.

Damaturu na-anabata ụlọ akwụkwọ atọ dị elu Federal Polytechnic Damaturu, Mahadum Yobe Steeti na ụlọ ọmụmụ nke Nọọsụ.

Akụkọ ihe mere eme

[dezie | dezie ebe o si]

Damaturu malitere dị ka ógbè mgbe Ndị Britain wepụrụ ya na mpaghara Alagarno. Ọ rụpụtara na mmeri nke Alaeze Ukwu Bornu n'afọ 1902 site n'aka ndị agha na-achị ala n'okpuru iwu nke kọlọnel Thomas Morland.

Boko Haram

[dezie | dezie ebe o si]

Ndị nnupuisi Boko Haram jihadist wakporo Damaturu ọtụtụ ugboro na mkpọsa ime ihe ike ha iji guzobe kalifetị́ n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ.[3]

N'ọnwa Nọvemba afọ 2011, ha gburu ihe karịrị mmadụ otu narị n'usoro mwakpo.

N'ọnwa Disemba afọ 2011, ha mere bọmbụ abụọ.

N'ọnwa Juunu afọ 2012, ndị nnupụisi iri anọ batara n'ụlọ mkpọrọ. Ndị mkpọrọ dị iri anọ gbapụrụ ma gbuo mmadụ asatọ.

N'ọnwa Juunu afọ 2013, ndị nnupụisi wakporo ụlọ akwụkwọ ma gbuo mmadụ iri na atọ, gụnyere ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi.[4]

N'ọnwa Ọktoba afọ 2013, ndị agha lụrụ ọgụ ogologo oge ma wakpo ụlọ ọgwụ.[5]

N'ọnwa Disemba afọ 2014, ndị agha mere mwakpo ọzọ. A nụrụ ụda égbè na mgbawa ma kọọrọ na a gbara ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na-eme ngagharị iwe ọkụ. Mahadum Yobe Steeti bịakwara n'okpuru mwakpo.[6]

N'ọnwa Febụwarị afọ 2015, otu nwanyị nke bụ oji bọmbụ egbu onwe ya gburu mmadụ iri na isii n'ọdụ ụgbọ ala.

N'ọnwa Febụwarị afọ 2020, e gburu ọtụtụ mmadụ na Auno n'okporo ụzọ awara awara Damaturu-Maiduguri. Ndị nnupụisi gburu ndị njem iri atọ, gbaa ụgbọala ọkụ ma tọọrọ ndị mmadụ. [7] [8][9]

Ọdịdị ala

[dezie | dezie ebe o si]

koodu ozi nke mpaghara ahụ bụ narị isii nà iri abụọ. [10] Mpaghara Gọọmentị Obodo nwere mpaghara nke puku abụọ, narị atọ na iri isii na isii km2 na ọnụ ọgụgụ mmadụ nke dị puku narị iri asatọ na asatọ, iri na anọ na ọnụ ọgụgụ nkè afọ 2006. [2] 

Obodo Damaturu dị n'okporo ụzọ awara awara A3 ma n'afọ 2010, o nwere ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya dị puku narị iri anọ na anọ, narị abụo na iri isii na asatọ. [11]

Ahịrị ugwu ọwụwa anyanwụ nke latitude na longitude hà nhata na-agafe ebe ahụ, gụnyere iri nà abụọ°00′00′′N iri nà abụọ°00′′E / 12.00000°N 12.00000 °E / 12.00,000; 12.00000 n'ebe ugwu.

Ọnọdụ ihu igwe

[dezie | dezie ebe o si]

Oge mmiri ozuzo, Damaturu na-ere ọkụ, na-emegbu mmadụ, ma na-enwekarị igwe ojii, ebe Oge ọkọchị adịghị mma, ikuku, na igwe ojii. Nkezi okpomọkụ kwa afọ dị site na iri ise nà asatọ ruo òtù narị na anọ degrees Fahrenheit, na iri ise nà abụọ na narị na iteghete degrees Fahrenheim bụ ihe a na-adịghị ahụkebe. [12] [13][14] Oge kachasị ukwuu n'afọ iji gaa Damaturu maka ihe omume ihu igwe na-ekpo ọkụ, dịka akara ndị njem nleta si dị, bụ site n'etiti ọnwa Disemba ruo mmalite ọnwa Febụwarị.

Nkezi Okpomọkụ na Damaturu

[dezie | dezie ebe o si]

Site n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Machị ruo abali iri abụo na atọ nke ọnwa Mee, oge okpomọkụ, nke nwere okpomọkụ dị elu kwa ụbọchị karịa otu narị° F, na-adịru ọnwa abụọ mara ụma anọ.Na Damaturu, ọnwa Eprel bụ ọnwa kachasị ọkụ n'afọ, na nkezi elu nke dị narị na anọ ° F na ala nke iri asaa na isii° F.

Site n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Julaị ruo abali iri abụo na isii nke ọnwa Septemba, oge oyi, nke nwere nkezi okpomọkụ dị elu kwa ụbọchị n'okpuru iri iteghete° F, na-adịru ọnwa abụọ mara ụma atọ . Na Damaturu, Jenụwarị bụ ọnwa kachasị jụụ n'afọ, na nkezi ala nke iri ise nà asatọ° F na elu nke iri iteghete° F.[15]

  • Ndepụta nke Ógbè Gọọmentị Na-achị Na Yobe Steeti

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Damaturu | Location & Facts | Britannica (en). www.britannica.com. Retrieved on 15 February 2022.
  2. 2.0 2.1 Omipidan. "Boko Haram: how it all started", The Sun (Nigeria), 17 June 2011. Retrieved on 29 May 2020.Omipidan, Ismail (17 June 2011). Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Omipidan" defined multiple times with different content
  3. Boko Haram attacks Yobe community, targets Damaturu, destroys phone... (en-GB) (16 February 2020). Retrieved on 21 February 2020.
  4. "Nigeria militants kill school children in Maiduguri", BBC News, 18 June 2013. Retrieved on 19 June 2013.
  5. "Nigerian militants raid northern city of Damaturu", BBC News, 26 October 2013. Retrieved on 23 October 2013.
  6. "Nigerian unrest: Damaturu city 'under militant attack'", BBC News, 1 December 2014.
  7. 30 Killed in Boko Haram Attack on Maiduguri-Damaturu Highway (en-US). THISDAYLIVE (10 February 2020). Retrieved on 21 February 2020.
  8. Many stranded as Boko Haram attacks communities on Damaturu-Maiduguri road (en-US). TheCable (6 January 2020). Retrieved on 21 February 2020.
  9. Boko Haram seizes Damaturu-Maiduguri road, travelers stranded (en-US). Pulse Nigeria (6 January 2020). Retrieved on 21 February 2020.
  10. Post Offices - with map of LGA. NIPOST. Archived from the original on 26 November 2012. Retrieved on 20 October 2009.
  11. The World Gazetteer. Archived from the original on 1 October 2007. Retrieved on 4 April 2007.
  12. Damaturu Climate, Weather By Month, Average Temperature (Nigeria) - Weather Spark (en). weatherspark.com. Retrieved on 16 July 2023.
  13. Damaturu, Yobe, NG Climate Zone, Monthly Averages, Historical Weather Data. tcktcktck.org. Retrieved on 16 July 2023.
  14. Climate & Weather Averages in Damaturu, Yobe, Nigeria (en). www.timeanddate.com. Retrieved on 16 July 2023.
  15. Damaturu Climate, Weather By Month, Average Temperature (Nigeria) - Weather Spark (en). weatherspark.com. Retrieved on 21 August 2023.
pFad - Phonifier reborn

Pfad - The Proxy pFad of © 2024 Garber Painting. All rights reserved.

Note: This service is not intended for secure transactions such as banking, social media, email, or purchasing. Use at your own risk. We assume no liability whatsoever for broken pages.


Alternative Proxies:

Alternative Proxy

pFad Proxy

pFad v3 Proxy

pFad v4 Proxy